Madeleine Albright
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Czechoslovakia, Njikota Obodo Amerika |
| Aha n'asụsụ obodo | Madeleine Albright |
| Aha ọmụmụ | Marie Jana Körbelová |
| Aha enyere | Madeleine |
| Aha ezinụlọ ya | Albright |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 15 Mee 1937 |
| Ebe ọmụmụ | Prague |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 23 Maachị 2022 |
| Ebe ọ nwụrụ | Washington, D.C. |
| Ụdị ọnwụ | eke na-akpata |
| Ihe kpatara ọnwụ | ọrịa kansa |
| Ebe olili | Oak Hill Cemetery |
| Ńnà | Josef Korbel |
| Ńné | Anna Spiegelová |
| Dị/nwunye | Joseph Albright |
| Nwa | Alice Albright, Anne Korbel Albright, Katie Albright |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Czech |
| Asụsụ ọ na-ede | English |
| Ụdị ọrụ ya | political science, foreign policy, diplomacy, opinion journalism |
| Onye were ọrụ | Georgetown University |
| Ọkwá o ji | United States Secretary of State, United States Ambassador to the United Nations |
| Ebe ọrụ | Washington, D.C. |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 1972 |
| Oge ọrụ ya (njedebe) | 2012 |
| Mmeko | Herbalife |
| Onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Democratic Party |
| Agbụrụ | Jew |
| Okpukpere chi/echiche ụwa | Episcopal Church |
| Onye òtù nke | American Academy of Arts and Sciences |
| Onye nwe | Madeleine Albright Collection |
Madeleine Jana Korbel Albright [1] (amụrụ Marie Jana Körbelová, Mee 15, 1937 - Maachị 23, 2022)[2][3] bụ onye nnọchi anya mba Amerịka na ọkà mmụta sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke a mụrụ na Czeck Republic, onye dịka onye otu Democratic Party.
O jere ozi dịka odeakwụkwọ nke iri isii na anọ nke mba Amerịka n'okpuru onyeisiala Bill Clinton site na 1997 ruo 2001,[4] bụrụ nwanyị mbụ nọ n'ọkwa ahụ.
Mbido ndụ ya
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Albright Marie Jana Körbelová na 1937 na Prague, Czechoslovakia.[12] Ndị mụrụ ya bụ Josef Korbel onye mba Czech, na Anna Korbel.[5]
Nne na nna ya tụgharịrị site n'okpukpe ndị Juu gaa n'okpukpe Katọlik wee kwaga na United Kingdom na 1939 ebe ha laghachiri na Prague ka Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị.[6][7]
Ezinụlọ ya kwagara United States na 1948.[8]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ezinụlọ ya biri na Denver, Colorado, wee ghọọ nwa amaala America na 1957.[9]Albright gụsịrị akwụkwọ na Wellesley College na 1959 wee nweta PhD na University Columbia na 1975.[10]
N'agbata 1976 ruo 1978, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye enyemaka nke Senator Edmund Muskie, tupu ọ rụọ ọrụ dị ka onye ọrụ na National Security Council n'okpuru Zbigniew Brzezinski. Ọ jere ozi n'ọkwa ahụ ruo n'afọ 1981 mgbe Onye isi ala Jimmy Carter hapụrụ ọrụ.[11]
Mgbe ọ hapụsịrị National Security Council, Albright sonyeere ngalaba agụmakwụkwọ nke Georgetown University na 1982 wee dụọ ndị na-eme ntuli aka Democratic ndụmọdụ gbasara amụma mba ofesi. Na-esochi ntuli aka onye isi ala nke 1992, Albright nyere aka kpọkọta Onye isi ala Bill Clinton's National Security Council. A họpụtara ya onye nnọchi anya United States na United Nations, ọnọdụ ọ nọrọ ruo mgbe e buliri ya dị ka odeakwụkwọ steeti na 1997 ghọrọ nwanyị mbụ jere ozi ahụ ruo Condoleezza Rice na 2001.[12]
Albright jere ozi dị ka onye isi oche nke Albright Stonebridge Group, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ndụmọdụ. Onye isi ala Barack Obama nyere ya nrite onye isi ala nke nnwere onwe na Mee 2012.[13]Albright jere ozi na bọọdụ Council on Foreign Relations.[14]
Ndụ onwe ya
[dezie | dezie ebe o si]Albright lụrụ Joseph Albright na 1959. Di na nwunye ahụ nwere ụmụ nwanyị n'atọ tupu ha agbaa alụkwaghịm na 1982. A zụlitere ya ndị Katọlik, mana ọ ghọrọ onye Episcopal Church n’oge alụmdi na nwunye ya na 1959.[15][6]
Albright nwụrụ site na ọrịa kansa na Washington, D.C., na Machị 23, 2022, mgbe ọ dị afọ 84 na e mere olili ya na Eprel 27 yana ọtụtụ ndị isi bịara.[16]
Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Sciolino. "Dukakis's Foreign Policy Adviser: Madeleine Jana Korbel Albright", The New York Times, July 26, 1988. Retrieved on July 19, 2015.
- ↑ "Madeleine Albright Fast Facts", CNN, May 8, 2014. Retrieved on December 31, 2014.
- ↑ Cohen. "Memory Goes to War", The New Republic. Retrieved on December 31, 2014.
- ↑ Dumbrell (December 2008). "President Clinton's Secretaries of State: Warren Christopher and Madeleine Albright". Journal of Transatlantic Studies 6 (3): 217–227. DOI:10.1080/14794010802548016. Retrieved on September 20, 2019.
- ↑ "Biography at The Washington Post", December 15, 1999.
- 1 2 "Madeleine Albright's War Years". Tablet Magazine. April 26, 2012. Archived from the original on March 10, 2013. Retrieved December 31, 2014.
- ↑ Carlin, John. "Profile: She who knows tyranny; Madeleine Albright", The Independent, February 8, 1998.
- ↑ Passenger Manifest. The Statue of Liberty – Ellis Island Foundation. Archived from the original on December 31, 2014. Retrieved on March 16, 2026.
- ↑ Brockes, Emma. "Interview: Madeleine Albright", The Guardian, October 30, 2003. (in en-GB)
- ↑ Williams, Ian. "Albright's State Deportment", February 25, 1999. (in en-US)
- ↑ Sciolino, Elaine. "Madeleine Albright's Audition", The New York Times, September 22, 1996. (in en-US)
- ↑ Biography: Madeleine Korbel Albright. Office of the US Secretary of State. Archived from the original on February 4, 2016. Retrieved on March 16, 2026.
- ↑ "Albright, Dylan among recipients of Presidential Medal of Freedom", CNN, May 29, 2012.
- ↑ Board of Directors. Council on Foreign Relations. Archived from the original on June 5, 2009. Retrieved on March 16, 2026.
- ↑ Dobbs, Michael. "Becoming Madeleine Albright", May 2, 1999.
- ↑ Funeral service for Madeleine Albright held at Washington National Cathedral (April 27, 2022).